18 ma ndi ahu, mb͕e ha kpesirim ikpé, ha zubere irapum ka m'la, n'ihi na ọ dighi ihe kwesiri onwu dim n'aru.
19 Ma mb͕e ndi-Ju kwugidere ya, erugiderem ka m'kpọkue Sisa; ọ bughi na enwerem ihe ibo mba nkem ebubo.
20 Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a
21 Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi.
22 Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.
23 Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.
24 Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi.