13 Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:
14 ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.
15 Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.
16 Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?
17 Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke.
18 Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.
19 Jehova, n'ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.