10 o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram.
11 Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek.
12 Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.
13 O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.
14 Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume.
15 Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.
16 Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ;