5 Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.
6 Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n'etiti ha: n'ihi na okwu eze bu ihe-árú n'anya Joab.
7 Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.
8 Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n'ihe a m'meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.
9 Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si,
10 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n'iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.
11 Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n'onwe-gi otù n'ihe ndia;