26 ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya.
27 N'ihi na n'okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n'onye b͕ara orú arọ we gaba.
28 N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;
29 na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ;
30 na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi;
31 na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova:
32 ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.