24 Shebuel nwa Giashon, nwa Moses, bu kwa onye-isi ulo-àkù nile.
25 Umu-nne-ya kwa; bú umu nke Elieza: Rehabaia nwa-ya, na Jeshaia nwa-ya, na Joram nwa-ya, na Zikri nwa-ya, na Shelomot nwa-ya.
26 Shelomot nka na umu-nne-ya bu ndi-isi ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile nke Devid, bú eze, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na usu ọgu ndikom ise, na ndi-isi usu-ndi-agha, doro nsọ.
27 Site n'agha-ha nile, bú site n'ihe-nkwata, ka ha doro ya nsọ ime ka ulo Jehova di ike.
28 Ya na ihe nile Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na Sọl nwa Kish, na Abnea nwa Nea, na Joab nwa Zeruaia, doro nsọ; onye ọ bula nke doro ihe nsọ, ọ di n'aka Shelomit na umu-nne-ya.
29 Nke ndi Izha, Kenania na umu-ya ndikom diri ozi èzí n'ebe Israel nọ, ibu ndi-odozi-okwu na ibu ndi-ikpe.
30 Nke ndi Hebron, Hashabaia na umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, nnù ndikom anọ na ọgu ise, bu ndi-isi nlekọta Israel n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu; bayere ozi nile nke Jehova, baye-kwa-ra òfùfè eze.