20 nke umu Efraim, Hoshea nwa Azazaia: nke nkera ebo Manase, Joel nwa Pedaia:
21 nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea:
22 nke Dan, Azarel nwa Jeroham. Ndia bu ndi-isi ebo nile nke Israel.
23 Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n'onye b͕ara orú arọ we rida: n'ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe.
24 Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid.
25 Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n'ọhia, na n'obodo nile, na n'obodo ntà nile, na n'ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia:
26 onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub: