4 Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
5 Onye-isi usu-ndi-agha nke-atọ nke diri ọnwa nke-atọ bu Benaia nwa Jehoiada onye-nchu-aja, ọ bu onye-isi: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
6 Onye ahu bu Benaia nke bu dike nke orú ndikom na iri ahu, ọ bu kwa onye-isi orú na iri ahu: Amizabad nwa-ya di kwa n'òkè-ya.
7 Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
8 Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
9 Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
10 Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.