56 ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.
57 Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;
58 na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;
59 na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:
60 site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.
61 Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà.
62 Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.