28 Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha.
29 Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.
30 Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche.
31 Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n'ite isi ihe.
32 Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.
33 Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.
34 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.