2. Ihe Emere 13:8-14 IGBOB

8 Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gēme onwe-unu ka unu di ike n'iru ala-eze Jehova n'aka umu Devid; unu onwe-unu bu kwa ìgwè bara uba, n'etiti unu ka umu-ehi ọla-edo di kwa, bú nke Jeroboam mere nye unu ibu chi.

9 Ùnu akwapughi ndi-nchu-àjà Jehova, bú umu Eron, na ndi Livai, mere onwe-unu ndi-nchu-àjà dika ndi ala ọzọ nēme? onye ọ bula nke nābia iwere nwa oke-ehi na ebulu asa meju aka-ya, ọ gāghọ-kwa-ra ndi nābughi Chineke onye-nchu-àjà.

10 Ma ayi onwe-ayi, Jehova bu Chineke-ayi, ayi arapughi kwa Ya; ndi-nchu-àjà nēje-kwa-ra Jehova ozi, bú umu Eron, ndi Livai nọ kwa n'ije-ozi-ha:

11 ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.

12 Ma, le, Chineke nọyere ayi, dika onye-isi-ayi, Ya na ndi-nchu-àjà-Ya, ndi chiri opì ahu, bú nke eji fù ka ha we dasie udà ike, ifù ha ka ha we dasie uda ike megide unu. Umu Israel, unu ebusola Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, agha; n'ihi na ọ gaghi-agara unu nke-ọma.

13 Ma Jeroboam mere ka ndi nēru nbì b͕a buruburu ibia n'azu ha: ha we di n'iru Juda, ma ndi nēru nbì di n'azu ha.

14 Juda we le anya n'azu, ma, le, anēbuso ha agha n'iru na azu: ha we tikue Jehova nkpu, ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì.