17 Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha.
18 Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.
19 N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.
20 Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, we biakute ya, kpab͕ue ya, ma o meghi ya ka ọ di ike.
21 N'ihi na Ehaz kère ulo Jehova, na ulo eze na ndi-isi, nye eze Asiria òkè: ma ọ bughi ihe yere ya aka.
22 Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.
23 O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.