22 Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.
23 O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.
24 Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-àjà di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem.
25 N'obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, o we kpasue Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà, iwe.
26 Ma ihe nile o mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.
27 Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo ahu, bú nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n'ílì ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.