26 Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì.
27 Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel.
28 Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku.
29 Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala.
30 Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala.
31 Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku.
32 Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova.