1 Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.
2 Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiaru Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.
3 Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze n'ememe, nke ahu bu ọnwa nke-asa.
4 Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.
5 Ha we bugota ib͕e ahu, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bugotara ha.
6 Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọ n'iru ib͕e ahu, nāchu n'àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.
7 Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.