22 Ọ buru na nwoke emehie megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a:
23 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.
24 Ọ buru kwa na etib͕ue ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide gi; ọ buru kwa na ha alaghachi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ amara n'iru Gi n'ulo a:
25 Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.
26 Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe ebe a di, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala:
27 Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, n'ihi na I nēzí ha ezi uzọ nke ha ganēje ije nime ya; Gi me kwa ka miri zokwasi ala-Gi, nke I nyeworo ndi-Gi ibu ihe-nketa.
28 Mb͕e oké unwu gādi n'ala, mb͕e ajọ ọria nke nēfe efe gādi, mb͕e nchakpọ gādi, ma-ọbu ọmuma-ebu, ma-ọbu igurube, ma-ọbu ọbubu; mb͕e ndi-iro-ha gānọchigide ha n'agha n'ala nke ọnu-uzọ-ama nile ha; ihe-otiti ọ bula, ma-ọbu ọria ọ bula;