24 Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya;
25 O we zìe site n'aka Netan, bú onye-amuma, kpọ aha-ya Jedidaia, n'ihi Jehova.
26 Ma Joab busoro Raba nke umu Amon agha, were obodo eze.
27 Joab we zigara Devid ndi-ozi, si, Ebusowom Raba agha, ewerewokwam obodo miri.
28 Ma ub͕u a, chikọta ndi Israel fọduru, ma kwa ulo-ikwū-gi megide obodo ahu, were ya; ka mu onwem ghara iwere obodo ahu, ewe kpọkwasi ya aham.
29 Devid we chikọta ndi Israel nile, jerue Raba, buso ya agha, were ya.
30 O we kpupu okpu-eze nke eze-ha n'isi-ya; ọtùtù-ya bu otù talent ọla-edo, nkume di oké ọnu-ahia di kwa ya; o we di n'isi Devid. O weputa-kwa-ra ihe-nkwata obodo ahu, nke riri nne nke-uku.