2. Samuel 20 IGBOB

1 Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.

2 Ndikom nile nke Israel we si n'iso Devid rigo, so Sheba nwa Bikri: ma ndikom Juda rapara n'aru eze-ha, site na Jọdan we rue Jerusalem.

3 Devid we biarue ulo-ya na Jerusalem; eze we chiri ndinyom iri ahu, bú ndi-iko-ya, ndi o mere ka ha nọdu iche ulo, o we tiye ha n'ulo-ndebe, nāzu ha, ma ọ bakurughi ha. Ha we buru ndi emechibidoworo uzọ rue ubọchi ọnwu-ha, nādi ndu dika ndinyom di-ha nwuru.

4 Eze we si Amasa, Kpọkọtaram ndikom Juda n'ubọchi atọ, gi onwe-gi guzo kwa n'ebe a.

5 Amasa we je ikpọkọta Juda: ma ọ nọrọ ọdù kari mb͕e akara àkà nke ọ kaworo ya.

6 Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.

7 Ndikom Joab we soro ya pua, ha na ndi Keret na ndi Pelet, na ndi-dike nile: ha we si na Jerusalem pua, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.

8 Mb͕e ndi ahu nọ n'akuku nkume uku nke di na Gibeon, Amasa biara n'iru ha. Ma ekeworo Joab ihe-ọkiké, uwe-nwuda-ya ka o yikwasiri, ihe-ọkiké di kwa n'elu ya, ya na mma-agha ekekọtara n'úkwù-ya n'ọbọ-ya; ma mb͕e Joab putara mma-agha we dapu.

9 Joab we si Amasa, Ọ̀ bu n'udo ka i nọ, nwa-nnem? Joab we were aka-nri-ya jide Amasa n'afu-ọnu isutu ya ọnu.

10 Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.

11 Ma otù nwoke n'etiti umu-okorọbia Joab guzoro n'akuku ya, si, Onye ọ bula ihe Joab nātọ utọ, na onye ọ bula diri Devid, ya so Joab n'azu.

12 Ma Amasa nāturu n'ọbara n'etiti uzọ atuliri atuli. Nwoke ahu we hu na ndi Israel nile guzoro, o we bupu Amasa n'uzọ atuliri atuli chigharia n'ọhia, tukwasi uwe n'elu ya, mb͕e ọ huru na onye ọ bula nke biara n'ebe ọ di guzoro.

13 Mb͕e ebupusiri ya n'uzọ atuliri atuli, ndikom nile gabigara iso n'azu Joab, ichu Sheba nwa Bikri n'azu.

14 O we gabiga n'ebo nile nke Israel rue Ebel, na Bet-meaka, na ndi Bia nile: ewe kpọkọta ha, ha we bia so kwa ya n'azu.

15 Ha we bia nọchigide ya n'agha n'Ebel Bet-meaka, wukọta ihe-ntukọba imegide obodo ahu, o we guzo nime ékpè: ndi nile soro Joab nēbibimb͕idi, ime ka ọ da.

16 Otù nwayi nke mara ihe we si n'obodo ahu kpọ òkù, si, Nurunu, nurunu; biko, sinu Joab, Biarue nso n'ebe a, ka m'gwa gi okwu.

17 O we biarue ya nso; nwayi ahu we si, Gì onwe-gi bu Joab? Ọ si, Mu onwem bu ya. Nwayi ahu we si ya, Nuru okwu nile nke orù-gi nwayi. Ọ si Anamanu nọ̄.

18 Nwayi ahu we kwue, si, Ha nēkwu ekwu na mbu, si, Ha aghaghi iju ase n'Ebel: otú a ka ha kwuzu-kwa-ra okwu.

19 Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?

20 Joab we za, si, Ya burum ihe-árú, ya burum ihe-árú; m'gaghi-eloda ma-ọli, m'gaghi-ebibi kwa ma-ọli.

21 Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.

22 Nwayi ahu we biakute ndi obodo ahu nile n'amam-ihe-ya. Ha we bipu isi Sheba nwa Bikri, tupuru ya Joab. O we fùa opì-ike, ha we si n'obodo ahu b͕asa, nwoke ọ bula ọ la n'ulo-ikwū-ya. Joab we lata na Jerusalem jekuru eze.

23 Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:

24 Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:

25 Sheva bu ode-akwukwọ: Zedok na Abaiata bu ndi-nchu-àjà.

26 ọzọ kwa, Ira onye Jaia buru Devid onye-isi n'ije ozi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24