2. Samuel 14 IGBOB

1 Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ.

2 Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:

3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.

4 Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.

5 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n'ezie nwayi di-ya nwuru ka m'bu, dim anwuwo kwa.

6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.

7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.

8 Eze we si nwayi ahu, La n'ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.

9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N'isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n'isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.

10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.

11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.

12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.

13 Nwayi ahu we si, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i chère ihe di otú a megide ndi Chineke? n'ihi na eze nēkwu okwu a dika onye ikpe mara, ebe eze nādighi-eme ka onye nke ya achupuru achupu lata.

14 N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.

15 Ma ub͕u a, ebe m'biaworo igwa eze, bú onye nwem, okwu a, ọ bu n'ihi na ndim emewo ka m'tua egwu; nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka m'gwa eze okwu; eleghi anya eze gēme okwu nke orù-ya nwayi.

16 N'ihi na eze gānu, inaputa orù-ya nwayi n'ọbu-aka nwoke nāchọ ikpochapu mu na nwam nwoke n'otù n'ihe-nketa Chineke.

17 Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.

18 Eze we za, si nwayi ahu, Biko, ezonarilam okwu nke mu onwem nāju gi. Nwayi ahu we si, Biko, ka onye-nwem, bú eze, kwue.

19 Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:

20 ọ bu ichighari iru okwu a ka Joab, bú orù-gi meworo ihe a: ma onye-nwem bu onye mara ihe, dika amam-ihe nke mọ-ozi nke Chineke, ima ihe nile di n'uwa.

21 Eze we si Joab, Biko, le emewom ihe a: gi je kwa, me ka nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, lata.

22 Joab we da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, gọzie eze: Joab we si, Ta ka orù-gi mara na ahutawom amara n'iru-gi, onye-nwem, bú eze, ebe eze meworo okwu orù-ya.

23 Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.

24 Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.

25 Ma n'Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n'ọbu-ukwu-ya we rue opu-n'isi-ya ọlu adighi n'aru-ya.

26 Ma mb͕e ọ kọpuru isi-ya, (n'ihi na ọ bu n'ogwugwu arọ n'ọgwugwu arọ ka ọ nākọpu ya: n'ihi na agiri-isi di arọ́ n'isi-ya, o we kọpu ya:) o we tua agiri-isi di n'isi-ya ọgu shekel iri, n'ihe-ọtùtù eze.

27 Ewe muara Absalom umu-ndikom atọ, na otù nwa-nwayi, aha-ya bu Tema: onye ahu bu nwayi mara nma ile anya.

28 Absalom we biri na Jerusalem arọ abua zuru ezu; ma ọ hughi iru eze.

29 Absalom we zigara Joab ozi, iziga ya jekuru eze; ma o kweghi ibiakute ya: O we ziga ọzọ nke ub͕ò abua, ma ọ kweghi ibia.

30 O we si ndi-orù-ya, Lenu, òkè ala-ubi Joab di n'akuku alam, o nwe-kwa-ra ọka barley n'ebe ahu: jenu, sue ya ọku. Ndi-orù Absalom we sue òkè ala-ubi ahu ọku.

31 Joab we bilie, biakute Absalom rue ulo-ya, si ya, N'ìhi gini ka ndi-orù-gi suworo òkè ala-ubim ọku?

32 Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua.

33 Joab we biakute eze, gosi ya: o we kpọ Absalom, o we biakute eze, kpọ isi ala nye ya, kpuchie iru-ya n'ala n'iru eze: eze we sutu Absalom ọnu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24