2. Samuel 11 IGBOB

1 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.

2 O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.

3 Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het?

4 Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n'ulo-ya.

5 Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime.

6 Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia.

7 Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga.

8 Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu.

9 Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya.

10 Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n'ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi?

11 Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.

12 Devid we si Uraia, Nọdu kwa n'ebe a ta, echi ka m'gezilaga kwa gi. Uraia we nọdu na Jerusalem ubọchi ahu na echi-ya.

13 Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya.

14 O rue, n'ututu, na Devid degara Joab akwukwọ, we ziga ya site n'aka Uraia.

15 O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua.

16 O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n'ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ.

17 Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n'etiti ndi Israel we da, bú n'etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra.

18 Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n'agha ahu;

19 o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile,

20 o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta?

21 ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n'isi-ya, o we nwua na Tibez? n'ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

22 Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya.

23 Onye-ozi ahu we si Devid, Ndikom ahu di ike imegide ayi, we pukute ayi rue ọhia, ayi we bugide ha agha rue oghere ọnu-uzọ-ama.

24 Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n'etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa.

25 Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike.

26 Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n'obi.

27 Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24