2. Samuel 5 IGBOB

1 Ebo Israel nile we biakute Devid rue Hebron, kwue, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.

2 Na mb͕e gara aga, mb͕e Sọl bu eze-ayi, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel.

3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.

4 Onye b͕ara orú arọ na iri ka Devid bu mb͕e ọ malitere ibu eze, ọgu arọ abua ka ọ bu eze.

5 Na Hebron ka ọ bu eze Juda arọ asa na ọnwa isi: na Jerusalem ka ọ bu kwa eze Israel na Juda nile orú arọ na iri na atọ.

6 Eze na ndikom-ya we jerue Jerusalem jekuru ndi Jebus, bú ndi bi n'ala ahu: ha we gwa Devid okwu, si, I gaghi-abata n'ebe a, kama ndi-ìsì na ndi-ngwurọ gēme ka i wezuga onwe-gi: nāsi, Devid agaghi-abata n'ebe a.

7 Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.

8 Devid we si n'ubọchi ahu, Onye ọ bula nke netib͕u ndi Jebus, ya jerue ebe miri si aga, we tib͕ue ndi-ngwurọ na ndi-ìsì, bú ndi nkpuru-obi Devid nākpọ asì. N'ihi nka ka ha nāsi, Ndi-ìsì na ndi-ngwurọ nọ; ọ gaghi-abà n.ulo.

9 Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike, o we kpọ ya obodo Devid. Devid we wue obodo gburugburu site na Milo we rue n'ime-ya.

10 Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya.

11 Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n'osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo.

12 Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, ọ ma-kwa-ra na O buliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.

13 Devid we si na Jerusalem kuru ndi-iko nwayi na ndinyom ọzọ, mb͕e o siri na Hebron biasi: ewe muara Devid umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ

14 Ndia bu kwa aha ndi amuru ya na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon,

15 na Ibha, na Elishua; na Nefeg, na Jafia;

16 na Elishama, na Eliada, na Elifelet.

17 Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike.

18 Ma ndi Filistia biara, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

19 Devid we jua Jehova ase, si, M'gārigokuru ndi Filistia? Ì gēnye ha n'akam? Jehova we si Devid, Rigo: n'ihi na aghaghm inye ndi Filistia n'aka-gi.

20 Devid we biarue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; o we si, Jehova ekwopuwo megide ndi-irom n'irum, dika nkwopu miri. N'ihi nka ka ọ kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

21 Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.

22 Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.

23 Devid we jua Jehova ese, O si, Arigola: ga gburugburu rue n'azu ha, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

24 O gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gēme ngwa: n'ihi na mb͕e ahu ka Jehova puworo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

25 Devid we me otú a, dika Jehova nyere ya iwu; o we tib͕ue ndi Filistia site na Geba rue ebe i nāba Gezea.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24