16 Ọ si ya, Emela otú a, n'ihi na ihe ọjọ uku a n'izilagam jọrọ njọ kari nke-ọzọ nke i merem. Ma o kweghi ige ya nti.
17 O we kpọ nwa-okorọbia-ya nke nejere ya ozi, si, Biko, si n'ebe m'nọ chupu nwayi a n'èzí, kpachie uzọ n'azu ya.
18 Ma uwe-nwudaa nwere aka di n'aru ya: n'ihi na uwe-nwuda di otú a ka umu-ndinyom eze ndi nāmaghi nwoke nēyi. Onye nējere ya ozi we me ka ọ pua n'èzí, we kpachie uzọ n'azu ya.
19 Tema we būru ntu n'isi-ya dọwa uwe-nwuda nwere aka nke di n'aru ya; ọ tukwasi aka-ya n'isi-ya, we la, nēje nēti nkpu.
20 Absalom, bú nwa-nne-ya, we si ya, Amnon nwa-nne-gi, ò sorowo gi dina? ma ub͕u a, nwa-nnem, b͕a nkiti: nwa-nne-gi ka ọ bu; atukwasila obi-gi n'ihe a. Tema we nọdu dika nwayi arapuru nání ya, n'ulo Absalom nwa-nne-ya.
21 Ma eze, bú Devid, nuru ihe ndia nile, iwe-ya we di ọku nke-uku.
22 Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.