1 Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ.
2 Joab we ziga ozi na Tekoa, si n'ebe ahu kuta otù nwayi mara ihe, si ya, Biko, me onwe-gi onye nēru újú biko, yiri kwa uwe iru-újú, ete-kwa-la onwe-gi manu, kama di ka nwayi nke nēru újú ọtutu ubọchi ndia n'ihi onye nwuru anwu:
3 i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.
4 Nwayi Tekoa we gwa eze okwu, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala, si, Zọputam eze.
5 Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, n'ezie nwayi di-ya nwuru ka m'bu, dim anwuwo kwa.
6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.
7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.