6 Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.
7 Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.
8 Eze we si nwayi ahu, La n'ulo-gi, mu onwem gēnye kwa iwu bayere gi.
9 Nwayi Tekoa ahu we si eze, N'isim, onye-nwem, eze, ka ajọ omume a di, na n'isi ulo nnam: ma ka eze na oche-eze-ya buru ndi ikpe nāmaghi.
10 Eze we si, Onye nāgwa gi okwu, me ka ọ biakutem, ọ gaghi-emetu kwa gi aka ọzọ.
11 Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.
12 Nwayi ahu we si, Biko, ka nwayi nējere gi ozi gwa onye-nwem, bú eze, okwu. Ọ si, kwue.