17 Eze we pua, ya na ndi-ya nile ndi soro ya n'ukwu n'ukwu; ha we nọdu na Bet-meahak.
18 Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.
19 Eze we si Itai, bú onye Gat, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēso kwa ayi je? laghachi, soro eze nọdu: n'ihi na onye ala ọzọ ka i bu, onye rapuru ala-ya ka i bu kwa; laghachi n'ebe-gi.
20 nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.
21 Itai we za eze, si, Jehova nādi ndu, onye-nwem, bú eze, nādi kwa ndu, n'ezie n'ọnọdu ebe onye-nwem, bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu ọnwu ma-ọbu idi ndu, n'ezie n'ebe ahu ka orù-gi gānọ kwa.
22 Devid we si Itai, Je gabiga. Itai onye Gat we gabiga, ya na ndikom-ya nile, na umu-ntakiri nile nke di n'aka-ya.
23 Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.