1 Ewe gosi Joab, si, Le, eze nākwa ákwá, nēru-kwa-ra Absalom újú.
2 Nzọputa we ghọrọ ndi Devid nile iru-újú n'ubọchi ahu: n'ihi na ndi Devid nuru n'ubọchi ahu, si, Ọ nēwuta eze n'ihi nwa-ya.
3 Ndi Devid we ghèré bà n'obodo n'ubọchi ahu, dika ndi ihere nēme nēghepu mb͕e ha nāb͕alaga n'agha.
4 Ma eze kpuchiri iru-ya, eze we tie nkpu n'oké olu, si, Nwam Absalom, Absalom, nwam, nwam!