34 Bazilai we si eze, Ùbọchi arọ nke ndum di ole, m'gēji soro eze rigorue Jerusalem?
35 Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?
36 Dika ihe ntà orù-gi nēso eze gabiga Jọdan: n'ìhi gini kwa ka eze gēnyeghachim ihe-nnyeghachi a?
37 Biko, ka orù-gi laghachi, ka m'we nwua n'obodom, n'akuku ílì nnam na nnem. Ma, le, orù-gi, bú Kimham; ya soro onye-nwem, bú eze, gabiga; gi me-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi.
38 Eze we si, Kimham gēsom gabiga, mu onwem gēme-kwa-ra ya ihe di nma n'anya-gi: ma ihe ọ bula i gārọputa ka m'mere gi, m'gēmere gi ya.
39 Ndi Devid nile we gabiga Jọdan, eze gabiga-kwa-ra: eze we sutu Bazilai ọnu, gọzie ya: o we laghachi n'ebe-ya.
40 Eze we gabiga rue Gilgal, Kimham so-kwa-ra ya gabiga: ndi nile nke Juda we me ka eze gabiga, ha na nkera ndi Israel.