1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl:
2 ọ we si,Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;
3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.
4 Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,Ewe zọputam n'aka ndi-irom.