12 O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
13 Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru YaAfunwuru icheku ọku.
14 Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.
15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Àmùmà kwa, O we chusa ha.
16 Ewe hu ebe osimiri si erù,Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,N'ibasi-nba-ike nke Jehova,Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.
17 O si n'elu zìe, kurum,Dọputam n'ọtutu miri;
18 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim