15 O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;Àmùmà kwa, O we chusa ha.
16 Ewe hu ebe osimiri si erù,Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,N'ibasi-nba-ike nke Jehova,Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.
17 O si n'elu zìe, kurum,Dọputam n'ọtutu miri;
18 Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
19 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.
20 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara:Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.