19 Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:Ma Jehova burum ihe-ndabere.
20 O we me ka m'puta rue ebe sara mbara:Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.
22 N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova,Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.
23 N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum:Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di.
24 M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem.
25 Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.