35 O nēzí akam abua ibu agha;Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36 I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
38 Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
39 M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.
40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.