37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
38 Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
39 M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:Ha we da n'okpuru ukwum abua.
40 I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.
43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.