42 Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.
43 Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.
44 I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
45 Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum:Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.
46 Ndi ala ọzọ nāta aru,Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
47 Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:
48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,