1 Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid.Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta,Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie,Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu,Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel:
2 Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum,Okwu-Ya di kwa n'irem.
3 Chineke Israel siri,Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:Onye nāchi madu bu onye ezi omume,Ọ nāchi n'egwu Chineke
4 Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,Bú ututu igwe-oji nādighi;Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala,Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.