2 Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum,Okwu-Ya di kwa n'irem.
3 Chineke Israel siri,Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu:Onye nāchi madu bu onye ezi omume,Ọ nāchi n'egwu Chineke
4 Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa,Bú ututu igwe-oji nādighi;Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala,Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.
5 N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ;N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem,Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra:N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile,N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.
6 Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile,N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:
7 Ma nwoke nke nēmetu ha akaGēnweju ígwè na osisi ube aka:Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.
8 Ndia bu aha ndi-dike, ndi Devid nwere; Josheb-bashebet onye-Tahkemonait, onye-isi nke ndi-ọchi-agha; onye ahu bu Adino onye-Eznait: onye nēmegide nnù ndikom abua eb͕uru n'otù ub͕ò.