14 Devid we zigara Ish-boshet nwa Sọl ndi-ọzi, si, Nyem nwunyem, bú Maikal, onye m'ji ọgu api ise nke ndi Filistia lutara onwem.
15 Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish.
16 Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.
17 Okwu Abnea we diyere ndi-okenye Israel, si, Na mb͕e gara aga unu nāchọ Devid ka ọ buru eze-unu:
18 Ma ub͕u a menu ya: n'ihi na Jehova ekwuwo okwu bayere Devid, si, M'gēwere aka Devid, bú orùm, zọputa ndim, bú Israel, n'aka ndi Filistia, na n'aka ndi-iro-ha nile.
19 Abnea kwu-kwa-ra na nti Benjamin: Abnea we je kwa ikwu na nti Devid nime Hebron ihe nile nke di nma n'anya Israel, na n'anya ulo Benjamin nile.
20 Abnea we biakute Devid rue Hebron, ya na orú ndikom. Devid we mere Abnea, me-kwa-ra ndikom soro ya, oké oriri.