2 Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru;
3 nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua;
4 nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital;
5 nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron.
6 O rue, mb͕e agha di n'etiti ulo Sọl na ulo Devid, na Abnea nēme onwe-ya ka ọ di ike n'ulo Sol.
7 Ma Sọl nwere iko-nwayi, aha-ya bu Rizpa, nwa-nwayi Aia. Ish-boshet we si Abnea, Gini mere i bakuru iko-nwayi nnam?
8 Iwe Abnea we di ọku nke-uku n'ihi okwu Ish-boshet, ọ si, Ọ̀ bu isi nkita nke ulo Juda nwere ka m'bu? Ta ka m'nēmere ulo Sọl, bú nna-gi, nēme-kwa-ra umu-nne-ya, nēme-kwa-ra ndi-eyì-ya, ebere, emeghkwam ka i rue Devid aka, ma i nēbom ebubo ajọ omume bayere nwayi a ta.