7 Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.
8 Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.
9 Devid we tua egwu Jehova n'ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem?
10 Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.
11 Ib͕e Jehova we nọdu n'ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile.
12 Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid.
13 O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà.