6 Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua:Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri,Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.
7 Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nileIhe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie:Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka,Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.
8 Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú:Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya:E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.
9 Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya;O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere:Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.
10 Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem:N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya,Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.
11 Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri;Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi:Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.
12 Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ?Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu,Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.