5 Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike:N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu.
6 Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim,Aka-nri-ya nāb͕akum.
7 Unu umu-ndinyom Jerusalem,Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli,Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
8 Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia,Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.
9 Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,Ọ nēsi na window nile lebata anya,Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.
10 Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.
11 N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;