Abù Nke Abù 3 IGBOB

1 N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

2 M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu,N'amá nile na n'ebe nile sara mbara,Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.

3 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum:M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?

4 Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga,Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:Ejiderem ya, arakwaghm ya aka,Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem,Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.

5 Unu umu-ndinyom Jerusalem,Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli,Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

6 Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku,Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense,Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?

7 Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere;Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu,Site na ndi-dike nke Israel.

8 Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha:Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya,N'ihi egwu n'abali.

9 Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquinSite n'osisi Lebanon.

10 Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me,Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me,Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma,Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8