Abù Nke Abù 2 IGBOB

1 Mu onwem bu rose nke Sheron,Abum urodi nke ndagwurugwu.

2 Dika urodi n'etiti ogwu,Otú a ka eyìm di n'etiti umu-ndinyom.

3 Dika osisi apple n'etiti osisi oké ọhia,Otú a ka onye ihe-ya nātọm utọ di n'etiti umu-ndikom.Ǹdò-ya ka m'chọsiworo ike, m'we nọdu ala,Nkpuru-ya tọ-kwa-ra okpo-ọnum utọ.

4 O mere ka m'bata n'ulo manya-vine,Ọkọlọtọ-ya n'elum bu kwa ihu-n'anya.

5 Werenu mbadamba nkpuru-vine amiri ami b͕am ume, werenu nkpuru-osisi apple me ka arum di ike:N'ihi na onye nāria ọria ihu-n'anya ka m'bu.

6 Aka-ekpe-ya di n'okpuru isim,Aka-nri-ya nāb͕akum.

7 Unu umu-ndinyom Jerusalem,Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma ọli,Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.

8 Ọ bu olu onye ihe-ya nātọm utọ! le kwa, ọ nābia,Nāmali elu n'elu ugwu nile, nāwuli elu n'elu ugwu ntà nile.

9 Onye ihe-ya nātọm utọ yiri mb͕ada ma-ọbu nwa-ele:Le kwa, ọ nēguzo n'azu mb͕idi-ayi,Ọ nēsi na window nile lebata anya,Anya-ya nēsi n'oghere-inara-ifufe nwubata.

10 Onye ihe-ya nātọm utọ zara, sim,Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

11 N'ihi na, le, mb͕e oyi agabigawo,Oké miri-ozuzo agawo, ọ lawo;

12 Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala;Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo,Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;

13 Osisi fig achawo nkpuru fig-ya nāchaghi acha,Osisi vine nile nāb͕awa okoko,Ha esìpuwo ísì utọ ha.Bilie, eyìm, onye nkem nke mara nma, bia.

14 Gi ndurum, nke di na nb͕awa nkume di elu, n'ebe-nzuzo nke ebe di nkputankpu,Me ka m'hu iru-gi, me ka m'nu olu-gi;N'ihi na olu-gi nātọ utọ, iru-gi ma-kwa-ra nma.

15 Nwuderenu ayi nkita-ọhia nile, bú nkita-ọhia di ntà, ndi nēmebi ubi-vine nile;N'ihi na ubi-vine-ayi nāb͕awa okoko.

16 Onye ihe-ya nātọm utọ bu nkem, mu onwem bu kwa nke ya:Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.

17 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,Chigharia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, me onwe-gi ka i yie mb͕ada ma-ọbu nwa-eleN'elu ugwu nile nke Beta.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8