Abù Nke Abù 5 IGBOB

1 Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem:Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam;Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum;Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim.Rienu ihe, ndi-eyim;Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.

2 Mu onwem nāraru ura, ma obim nēteta:Ọ bu olu nke onye ihe-ya nātọm utọ nāku aka n'uzọ, si,Megherem uzọ, nwa-nnem nwayi, eyìm, ndurum, onye nkem nke zuru okè:N'ihi na isim juputara n'igirigi,Agiri-isim juputara n'ọbubu-miri nke abali.

3 Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya?Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi?

4 Onye ihe-ya nātọm utọ setipuru aka-ya tiye n'oghere uzọ,Afọm we me nkpatu n'ihi ya.

5 Mu onwem biliri imeghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Akam abua nābusi kwa na myrrh,Nkpisi-akam nile nābusi kwa na myrrh nērù erù,N'elu nkpisi nile nke ugodi.

6 Mu onwem meghere onye ihe-ya nātọm utọ uzọ;Ma onye ihe-ya nātọm utọ wezugarari onwe-ya, gabiga.Nkpuru-obim apuwori mb͕e o kwuru okwu:Achọrọm ya, ma Achọtaghm ya;Akpọrọm ya òkù, ma ọ zaghm.

7 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum,Ha tirim ihe, b͕uem mma;Ndi-nche mb͕idi nile nke obodo chipuru ákwà-nb͕ochim n'arum.

8 Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.

9 Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Na i b͕awo ayi iyi otú a?

10 Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.

11 Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.

12 Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi;Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri.

13 Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ:Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù.

14 Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha:Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya.

15 Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha:Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8