3 Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu,Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma:Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi buN'azu ákwà-nkpuchi-gi.
4 Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di,Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri,Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.
5 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru,Nke nāta nri n'etiti urodi.
6 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,Mu onwem gēje n'ugwu myrrh,Na n'ugwu ntà frankincense.
7 I mazuru nma, eyìm;Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.
8 Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem,Si na Lebanon som:Site n'elu Amana le anya,Site n'elu Senia na Heamon,Site n'ebe-obibi nile nke ọdum.Site n'ugwu nile nke agu.
9 I riwo obim, nwa-nnem nwayi;I werewo otù nime anya-gi abua,I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.