3 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abuaNke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.
4 Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú;Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim;Imi-gi di ka ulo-elu LebanonNke chere Damaskọs iru.
5 Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel,Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo;Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.
6 Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku,Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile!
7 Ogologo-gi nka yiri nkwu,Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.
8 M'siri, M'gārigo elu nkwu,M'gējide igu-ya aka:Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine,Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;
9 Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma,Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ,Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.