29 Na mb͕e akara àkà ka ọ gābiaghachi, ba na Ndida; ma ọ gaghi-adi na mb͕e ikpe-azu otù ọ diri na mbu.
30 Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.
31 Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.
32 Ọ bu kwa ndi nēmebi iwu megide ọb͕ub͕a-ndu ahu ka ọ gēmeru site n'ire-utọ di iche iche: ma ndi ahu nke mara Chineke-ha gādi ike, me ihe.
33 Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi.
34 Ma mb͕e ha nāsu ngọngọ agēyere ha aka nke-ntà: ma ọtutu madu gēji ire-utọ di iche iche rapara ha n'aru.
35 Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.