Daniel 11:34-40 IGBOB

34 Ma mb͕e ha nāsu ngọngọ agēyere ha aka nke-ntà: ma ọtutu madu gēji ire-utọ di iche iche rapara ha n'aru.

35 Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.

36 Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme.

37 Ma ọ gaghi-atughari uche na chi nile nke nna-ya-hà, ma-ọbu n'ihe ahu ndinyom nāchọsi ike, ọ bu kwa na chi nile ọ bula ka ọ nāgaghi-atughari uche: n'ihi na n'elu ihe nile ka ọ gēme onwe-ya uku.

38 Ma ọ bu chi nke ebe nile siri ike ka ọ gāsọpuru n'ọnọdu-ya: ọ bu kwa chi nke nna-ya-hà nāmaghi ka o gēji ọla-edo, ji kwa ọla-ọcha, ji kwa nkume di oké ọnu-ahia, ji kwa ihe di iche iche anāchọsi ike, sọpuru.

39 Ọ gēmeso kwa ebe nile ewusiri ike nke ebe nile siri ike site n'iye-aka chi ala ọzọ: onye ọ matara gēme ka nsọpuru-ya ba uba; ọ gēme kwa ka ha chia ọra madu, ọ bu kwa ala ka ọ gēkè n'ọnu-ahia.

40 Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.