Daniel 6:1-7 IGBOB

1 Ọ di Daraiọs nma n'anya ido ọgu madu isi, bú ndi nọchiri anya eze, ka ha buru ndi-isi ala-eze-ya, ndi gānọ n'ala-eze ahu nile;

2 na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.

3 Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n'elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n'ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile.

4 Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n'ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n'aru ya.

5 Mb͕e ahu ndikom ndia nāsi, Ayi agaghi-achọputa ihe-ebubo iji bo Daniel nka, ma isi na ayi achọputaghi ya n'aru ya n'iwu nke Chineke-ya.

6 Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

7 Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum.