Daniel 6:12-18 IGBOB

12 Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.

13 Mb͕e ahu ha zara, si n'iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n'ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya.

14 Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya.

15 Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe.

16 Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.

17 Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n'ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel.

18 Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya.